1 Samuel 5

Igbe ọgbụgba ndụ nʼAshdọd na Ekrọn

1Mgbe ndị Filistia buuru igbe ọgbụgba ndụ Chineke, ha si Ebeneza buru ya buga Ashdọd. 2Ha butere igbe ọgbụgba ndụ Chineke, buba ya nʼime ụlọ Dagọn,
Dagọn bụ arụsị kachasị arụsị ndị ọzọ nke ndị Filistia na-efe. Gụọ ihe nkọwa banyere ya na Nkp 16:23
dọba ya nʼakụkụ Dagọn.
3Mgbe ndị Ashdọd tetara nʼisi ụtụtụ echi ya, ma lee, Dagọn adaala, kpuo ihu ya nʼala nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị. Ha bulikwara Dagọn elu doghachi ya nʼọnọdụ ya. 4Ma nʼụtụtụ echi ya, Dagọn adakwala kpuo ihu nʼala nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị. Isi ya na aka ya abụọ dakapụrụ, tọgbọrọ na mbata ọnụ ụzọ, Ọ bụkwa naanị ogwe ahụ ya fọdụrụ. 5Ọ bụ nke a mere, site mgbe ahụ ruo taa, ndị nchụaja Dagọn na ndị niile na-abata nʼụlọ Dagọn, adịghị azọ ụkwụ ha nʼọnụ ụzọ mbata ụlọ Dagọn dị nʼAshdọd.

6Aka Onyenwe anyị malitere ịdị arọ nʼahụ ndị Ashdọd, ha na obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu, o ji etuto dị iche iche menye ha egwu ma bibiekwa ha nʼAshdọd nʼoke ala ya niile. 7Mgbe ndị Ashdọd hụrụ ihe na-eme, ha sịrị, “Anyị achọghị ka igbe ọgbụgba ndụ Chineke nke Izrel dịrị nʼetiti anyị, nʼihi na aka ya dị ike nʼahụ anyị, otu aka ahụkwa na chi anyị Dagọn.” 8Ya mere, ha ziri ozi kpọkọta ndịisi ndị Filistia niile, jụọ ha sị, “Gịnị ka anyị ga-eme igbe chi ndị Izrel?”

Ha zara, “Ka e buru igbe chi ndị Izrel buga ya nʼobodo Gat.” Ya mere ha buuru igbe Chineke nke Izrel buga Gat.

9Ma mgbe ha bubatara ya na Gat, aka Onyenwe anyị malitere imegide obodo ahụ. O tinyere ndị obodo ahụ nʼọnọdụ oke egwu. O tiri ndị bi nʼobodo ahụ ihe otiti, ma nwantakịrị ma dimkpa, etuto dị iche iche toro ha nʼahụ. 10Ya mere, ha zilara igbe ahụ Ekrọn.

Ma mgbe igbe ahụ na-abata Ekrọn, ndị Ekrọn kwara akwa sị, “Ha e burula igbe ọgbụgba ndụ chi ndị Izrel butere anyị, ka anyị na ndị anyị nwụsịa!”
11Ya mere, ha kpọkọtara ndịisi ndị Filistia niile sị ha, “Sinụ nʼobodo zipụ igbe chi ndị Izrel, maọbụ zighachinụ ya nʼobodo e si bute ya na mbụ, ka ọ hapụ igbuchapụ anyị na ndị anyị.” Nʼihi egwu maka ọnwụ ejidela ndị niile bi nʼobodo. Aka Chineke dịkwa ike nke ukwuu megide obodo ahụ. 12Ndị na-anwụghị ka e mere ka etuto jupụta ha nʼahụ, mkpu akwa nke ndị obodo ahụ ruru eluigwe.

Copyright information for IboBIU